Genesis 15:18-21

18Nʼụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis. 19Ala ndị Ken, na nke ndị Keniz, na nke ndị Kadmọn, 20na ala ndị Het, na nke ndị Periz na nke ndị Refaim, 21na ala ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Gigash na nke ndị Jebus.”

Copyright information for IboBIU